Psalms 115

Nyenụ Chineke otuto

1Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị,
kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị,
nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.

2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?”
3Chineke anyị bi nʼeluigwe.
Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha,
ha bụ ọrụ aka mmadụ.
5Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
6ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe,
ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
7ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka,
ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije;
ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.
8Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha.
Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.

9Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
10Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi.
Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.
11Unu ndị na-atụ egwu ya, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi
ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha.

12 Onyenwe anyị na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị,
ọ ga-agọzi ndị ya bụ Izrel,
ọ ga-agọzi ezinaụlọ Erọn,
13ọ ga-agọzi ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị,
ma onye nta ma onye ukwu.

14Ka Onyenwe anyị mee ka unu mụbaa,
unu na ụmụ unu.
15Ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe na elu ụwa
gọzie unu.

16Eluigwe niile bụ nke Onyenwe anyị,
ọ bụkwa ya nyere ụmụ mmadụ elu ụwa niile.
17Ọ bụghị ndị nwụrụ anwụ na-eto Onyenwe anyị,
ndị na-arịda nʼebe ịnọ duu;
18ọ bụ anyị ga-aja Onyenwe anyị mma,
site ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU